Ihe BBC Igbo chọpụtara na njem ha mere n'Onitsha River Port

Mgbe akụkọ pụtachara na ụgbọmmiri bu ngwaahịa si Lagos bata mmiri Onitsha ka afọ 42 gachara, o nyere ndị mmadụ ọṅụ .

Mana BBC Igbo gbaruru ị ga-ahụ n'anya ha etu ọrụ si aga n'Onitsha River Port'.

Were anya gị kirie n'onyonyo a ihe anyị hụrụ dịka Queen Ubah bụ onyeisi Onitsha River Port kpọgharịrị BBC Igbo ebe ahụ.

Ubah kọwaara anyị ihe mere ọdọụgbọmmiri a ebubataghị ngwaahia kamgbe afọ iri anọ na abụọ gara aga.

Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo