Tọrọ atọ
Ndị Afrịka gara mkpọrọ n'agha mere n'ebe dị anya
Lud Beverley, bụbụ onyeagha Kadet si mba Kongo-Brazzaville, ji aka ya e kere akwa nke ụfọdụ mkpịsị aka ụfọdụ ya adịghị dị ya n'ihu ya.
Ọ nọ n'elu akwa dị n'ụlọọgwụ maka ndị mkpọrọ e jidere n'agha n' ndịda anyanwụ Yukren.
Nwa amadị ahụ gbara afọ 28 anọọla ebe ahụ ọnwa atọ oge BBC bịara leta ya na ngwụcha ọnwa Maachị iji mata ma ọnụọgụgụ ndịagha si Afrịka so n'agha dị n'etiti Rọshịa na Yukren.
Dịka ngụkọ Yukren si kwuo, otu n'ime ndịagha asatọ ha nwuchiri tụnye na mkpọrọ kemgbe afọ gara aga si Afrịka. Yukren nwere nkwenye na pasentị 10 n'ime mmadụ 27,000 na ụma bụ ndị mba ọzọ Rọshịa weere n'ọrụ iso lụrụ ha agha megide Yukren bụ ndị Afrịka.
Beverley kwuru n'olu Rọshịa banyere ahụ o merụụ sị, "Mgbe m na-arụ ọrụ e zuru m n'ihu agha, oyi merụrụ m ahụ- oge a nwụchiri m, ejizighị m mgbuchiaka."
"Anyị na-agaje n'a-agbaghị akpụkpọụkwụ.Nnukwu oyi na-atụ."
Ọ sịrị, "Mmerụahụ site akụmmiri oyi dị nnukwu njọ".
E zigara ya Rọshịa ịgụ akwụkwọ dịka onyeagha na-eto eto n'ụlọmmụta ndịagha mmiri, o mechara lụọ nwaanyị ma mụta otu nwanwaanyị. Mana ọ danyere na nsogbu ụkọ ego, malite rewe ọgwụ ike, si ebe ahụ nweta onwe ya na mkpọrọ Rọshịa. E kwere ya nkwa nnwereonwe maọbụ na o soro lụọ agha.
"Iji kwụọ ụgwọ mpụ m mere, ekpebiri m ịlụrụ Rọshịa agha , n'ihi nke a, ha ziga m."
Ohere ndị ntaakụkọ ịga n'ogige ndị e ji eji na-eme kwa Tọzde ikpe ọbụla n'ọnwa bụ ohere Yukren ji egosi etu ha si eme ndị ha nwụchiri n'agha ofụma. Ndị ọrụ gọọmentị enyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole nọ n'ogige ahụ kpọmkwem, karịa ikwu na ndị Afrịka ha nwụchiri n'agha si mba 15 n'Afrịka.
Beverely kwuru na ya enweghị mkpesa ọbula banyere etu e si eme ya , na ndị dọkịta nwere obiọma, ndụ n'ogige ahụ dịka ịnọ n'ọrụ amị, onweghị ihe dị ya,
Ndị mkpọrọ agha ejichiri na mkpọrọ na Yukren n'abalị 26 nke ọnwa, Novemba afọ 2025. Getty Images
Mana ọ o gosiri nchegharị oge a na-agba ya ajụjụọnụ- rịọrọ ezinaụlọ ya nakwa obodo ya bụ nke o kwuru na ha enweghị akụkụ ha kwụnyeere n'agha ahụ- ka ha gbara ya. Ọtụtụ n'ime ha chọrọ ka agha ahụ bie.
“Nnukwu ihe efuola akụkụ abụọ ahụ- Anọọla m ebe ahụ. Ọ dị egwu.”
Lud Beverly
Ndịagha a tụnyere na mkpọrọ na Yukren
Ndịagha a tụnyere na mkpọrọ
Ndị a nwụchiri n'agha a tụnyere na mkpọrọ kwetara ịgwa anyị ụzọ dị iche iche ha sị danye n'ọgụ ahụ, ọtụtụ n'ime ha chọrọ ịlaghachi Rọshịa iji nweta ego e ji ha - o nweghị onye n'ime ha chọrọ ịlaghachi n'ọgbọ agha.
Mgbe anyị rutere,anyị nụrụ ikpo ofe- anyị sonyere ndị nga ji akwa ndịagha miri dị ka ha guzo n'ahịrị na-eche nri ehihie.
E mechara ajụọ ndị mkpọrọ ahụ ma o nwere ndị chọrọ ịgwa ndị ntaakụkọ ụka. Ụfọdụ n'ime ha si Afrịka gbakọrọ n'azụ ụlọobibi ha: ndị na anọrọ onwe ha beere ebre n'akụkụ, ndị dị aghara na-ama onwe ha njakịrị, ụfọdụ ekweghị ka anya ha na onye ọzọ jekọọ ma ọlị.
Otu nwoke kuliri bịakwụte anyị oge ọ nụrụ na ndị BBC so na ndị ọbịa bịara.Ọ kọwara onwe ya dịka Richard Kanu si isiobodo Siera Lionụ bụ Freetown.
O kwuru na ịkọ akụkọ ya bụ ụzọ ya ga-eji agba ezinaụlọ ya na ụmụ ya atọ ume na ya ka dị ndụ.
Onye a dị afọ 43 anọla n’ogige a otu afọ, ma nọna n’aka mkpọrọ Ukraine afọ abụọ.
Dị ka Beverley, o nwekwara ndabere agha – mana ọ sịrị na ọ maghị na mgbe o nabatara ọrụ dịka onye nche, ọ ga-emecha nọ n’ebe a na-alụ ọgụ.
Dị ka Beverley, o nwekwara ndabere agha – mana ọ sịrị na ọ maghị na mgbe o nabatara ọrụ dịka onye nche, ọ ga-emecha nọ n’ebe a na-alụ ọgụ.
Nwa m nwanyị chọrọ ịbụ dọkịta. Achọrọ m inwe ike ịkwụ ụgwọ ọmụmụ ya na mahadum, ka o wee mezuo nrọ ya,” ka ọ gwara m
Obodo niile ọ rịọrọ visa jụrụ ya — e wezụga Russia. Mgbe ọ rutere ebe ahụ n’afọ 2024, ọ kpọtụrụ onye na-ahụ maka ọrụ, o nwekwara obi ụtọ nke ukwuu mgbe e nyere ya $15,000 ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ ọrụ otu afọ, yana ụgwọ ọnwa $2,000, n’agbanyeghị na ọ naghị asụ Russian. E zigara ya n’obodo ndịda a na-akpọ Rostov-on-Don, nke dị ihe dị ka kilomita 200 (maili 125) site n’ogige ọgụ dị na Yukren.
Dịka ọ kọwara na otu onye gwara ya na o binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ịrụrụ ndịagha Rọshịa otu afọ, sịrị,"Oge m rutere Rostov, ahụrụ m onwe m n'ogige ndịagha." Ọ gbakwojuru ya anya mana ọ kasiri onwe ya obi oge ọ nụrụ na ọ ga-enye ya ohere ịbụrụ nwamala Rọshịa.
"Otu afọ gachaa, m ga-enweta akwụkwọ mba Rọshịa , nwetakwa ego. M ga-enwe ohere ịkpọta ezinaụlọ m na Rọshịa. M ga-ebiwe ndụ onye nkịtị na Rọshịa."
Mana o kwuru na ihu ọgụ siri nnukwu ike n'ihi na akụkụ abụọ n'agha ahụ ji teknụzụ alụ ya. Ihe ụfọdụ ndị nga ahụ,gabigara ka na-emetụta ha ebe ahụ .
Na ụlọbibi ọzọ, onye nga bụ nwaafọ Kenya a kpọrọ Evans Kibet ekwebughị agwa anyị okwu mana oge m kelere ya n'olu Swahili, obi medara ya.
Mana oge Kibet nụrụ na ọtụtụ ezịnaụlọ chị obi n'aka n'ihi akụkọ na o nwere ndị alara n'ụzọ akwụghị ọtọ laga Rọshịa, kwee ha nkwa inye ha ezigbo ọrụ , ha rute ọ bụrụ ịga lụrụ Rọshịa agha, o jidenwụzighị onwe ya.
Ozi nnyocha sị Yukren na-ekwu na ndị Kenya kachasị n'ọnụọgụgụ ndị Afrịka etinyere n'ọrụ agha nke Rọshịa - ndị na-eso ha bu ndị Ijipt, ndị Kamerun, Ndị Gana na ndị Yuganda.
Nwaamadi ahụ dị afọ 36 kwuru sị, "Ihuagha abụghị ihe egwu.Mmadụ na-anwụ n'akanri, akaekpe na etiti. O nweghị onye chọrọ ịma."
Ọ kọwara etu dronụ si aghasa ozu ndị mmadụ n'ala n'ihu agha.
Ndịagha aga n'ịhụ eleghị anya n'azụ inyere onye ọbụla aka.
Ọ tụrụ ndịọrụ BBC otu nwoke bụkwa onye Kenya aka bụ onye nọ n'ogige obibiu ọzọ, sị na o nwere ike ọ masị ya ịgwa BBC okwu n'ihe onyonyo.
Willy Macharia nwere obi ụtọ ịkpasara BBC ụka tupu ọ gaa iri nri ehihie: Nri dị yafụ yafụ ebe ebe a. E nwere ohere iri nri ma emesịa.
Ihu ya bụ ihu onye dị afọ 23 fegharịị na soshal midia na-adọ ndị ntotorobịa Kenya aka na ntị ka ha ghara isonye n'ọrụ agha ndị Rọshịa.
Oge m jụrụ ya maka ya, o boro ebubo na ndịagha Yukren manyere ya mee ihe onyonyo ahụ.
E mechara m jụọ Petro Yatsenko, ọnụ na-ekwuru isi ụlọọrụ na-ahụ maka nleta ndị anwụchiri n'agha maka ya mana ọ gọrọ.
Macharia kwuru na ya nọrọ n'ihu agha ọnwa atọ- na e kwere ya nkwa ịkwụ ya ezigbo ụgwọ ma nye ya ohere agụmakwụkwọ. Mana ọ chọghị ikọ banyere etu e siri wee ya n'ọrụ ịlụ agha: "Ana m alụrụ Rọshịa ọgụ, ya mere, na m nọ na Yukren pụtara na m nọ n'aka ndịiro."
Iji na-egbu oge na ogige e tinyere ha,ka ndị nga ndị ọzọ, ọ na-arụ kịrịkịrị ọrụ iji nweta ego o ji azụ obere ihe dịka ihe ntagharịọnụ, ncha na shuga.
Ọ na-amụkwa asụsụ Yukren n'ọbaakwụkwọ nke ụlọmkpọrọ Yukren dịka ọ chọrọ ị na-aghọta ihe na-eme na gburgburu ya. Ọ na-agụsi nwokorobịa ahụ ike inwere onwe ya ma na-atụ anya na aha ya ga-adị n'aha ndịnga a ga-eji gbara ibe ha ka o were laghachie Rọshịa.
Mana Yatsenko, si na ụlọrụ na-ahasị ndịagha anwụchiri n'agha, enweghị olileanya na a ga-enwe mgbara ndịnga n'etiti ha na Rọshịa. Ka ọ dị ugbua, naanị Gana bụ mba si Afrịka tinyere anya n'ịkpọrọkwa ndị amaala ha,dịkaYatsenko si kwuo. - Ndị nnọchiteanya ha abịala n'ebe ahụ e jichiri ndị anwụchiri n'agha, ebe ha na Yukren na-akparịta etu ọ ga-esi aga.
“Ka ọ dị ugbua, ndị Afrịka esoghị na ndị e ji agbara ibe ha. Ha chọrọ ka agbara gafee Rọshịa n'ihi na ha chọọ ka a kwụọ ha ego. mana anyị enweghị ihe gosiri na Rọshịa chọrọ ịkpọchi ha azụ.”
Petro Yatsenko
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Yukren na--ahụka ndị ejidere n'agha.
A gbakwara Minista mba Yukren na-ahụ maka mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ bụ Andrii Sybiha, onye na-ahụta ndị Afrịka ahụ Rọshịa tinyere n'ọrụ ịlụ agha dịka 'mpụ meidere iwu ma bụụkwa ụzọ ịgbasa akụkọ ụgha."
"Ọ gwara m sị,"Mgbe ụfọdụ, a na-agwa ha bịa gụọ akwụkwọ na Rọshịa, ha bịa, ebe ọzọ ha ga-ahụ onwe ha bụ n'ihu agha."
Mịnịsta kwuru na ndị mbịarambịara nwere ike ịlụrụ Yukren agha- mana o kwechiri sị na ha anaghị eme ka Rọshịa, na ha na-agbaso usoro dị n'iwu.
Mana ndịagha e ji eji si Afrịka chọrọ ịlaghachi Rọshịa - mana nke a nwere ike ọ gaghị, naanị ma agha ahụ ebiri.
Nke Beverly abụghị naanị okwu ego - nwa ya nwaanyị nọ ebe ahụ, ọ bụrụ na ọ lawa Kongo n'otu anya, Ọ gaghị enweli ohere ịlaghachi Rọshịa.
Kanu kwechiri na o nweghịkwa ihe jịkọro ya na Ọdịda Anyanwụ Afrịka n'ọdịnihu: "Ebinyere m Rọshịa . Achọrọ m ịlaghachi Roshịa
Oge anyị hapụrụ Yukren anyị gawa Freetown ebe anyị zutere nwa Kanu gbara afọ 19 Elsie.
Ọ kwụ n'ihu ụlọ ha- ụlọ eji gbamgbam na akpakara igwe rụo.
“Ịlaghachi na Siera Lionu agaghị egbo mkpa ọbụla mere o jiri zọpụbuo ije.”
Elsie Kanu, 19
Onye lọghachiri
Ọtụtụ ndị agaghị alachigha ụlọ ha. Mana Duncan Chege, onye Kenya laruru. O si n'ụlọọgwụ ebe ebugara ya dịka ọ mere ka onye isi gbakara, dịka ọ ọ nọ na ndịagha Rọshịa.
Ọ bụ nkwa ịkpata ego bụ ihe kpọtara Chege. Nke abụ dịka ọ gbachara mbọ inweta ọrụ na Dubaị mana okwu akwụkwọ njem ghasaa ya. Ụlọọrụ na-achọrọ ya ọrụ were sị ya gaa Rọshịa bụ ebe o nwetara akwụkị̀ọ ikike ịbata n'otu izuụka.
Foto si n'aka Duncan Chege
Iji kwado ya ime njem ahụ, nne ya gbara mbibi n'aka ndị agbataobi na ndị bụ nwanne.
Duncan Chege
Mana ajụjụ maka ihe na-eche ụmụafọ Afrịka e ji na mkpọrọ n'agha edoghị anya.
EKELE
Odee:Sammy Awami, Onye si na Ndịda Anyanwụ Yukren ezite ozi
Onye nhazi na onye sere onyonyo: Hassan Lali
Nhazi:Millie Wachira
Onye tụtara alọ ihe akwụkwọ hụpụtara:Mayowa Alabi
Eserese: George Wafula
Foto: Ukraine (Getty Images), Sierra Leone na Kenya (Sammy Awami na Hassan Lali)
Ndị nyochara edemede: Lucy Fleming na Victor Oluoch
Onye chara ihe onyonyo a:Kathy Harcombe
Onyeisi ihu akwụkwọ: Dorothy Otieno
Nkwado: Shalom Olatunji, Brian Osweta, Njoroge Muigai, Boaz Ochieng na Damilola Ojetunde
Ụbọchị mbipụta akụkọ: 8 Juunụ afọ 2026

